Contacts Information for Female Religious Congregation in Nigeria

Contacts information for Male Religious Congregation in Nigeria

 

91. NKE UBOCHI NKITI N’OGE NCHETA AHUHU NKE ONYENWEANY III

NKE ỤBỌCHỊ NKITI N’OGE NCHETA AHỤHỤ NKE ONYENWEANYỊ III

Uru Nke Di N’ Ebumuonu

Maka Ịghọta Mmụọ Nke Oge Ncheta Nke Onyenweanyị

____________________________________________ 

O kwesiri ezie bụrụkwa ihe ziri ezi, na-azọ ndụ,

Na anyi ga-enye Gi ekene, oge nile,

N’ebe nile, O Nna di nso,

Chineke ji ike nile, Onye di ụwatụwa,

Site na Kiristi, Diwenụ anyị.

 

ị na-arịọ anyị ka anyị na egosipụta obi ekele anyị,

site n’ibu ọnụ na ịwọ onwe anyị ịhe

maka ọdịmma nke mmadụ ibe anyị.

Anyị kwesịrị inwe ike n’ebe ọnọdụ-njọ anyị dị,

ka anyị wee na-ebi ndụ eziomume

ma meriekwa nganga dị anyị n’ime.

Anyị kwesịrịkwara igosi  ndị nọ na mkpa

ịdịmma na obiọma Gị n’ebe anyị onwe anyị nọ.

 

Ugbu a, anyị na-esoro ndị mmụọọma na ndịnsọ niile

na-eto Gị ebeebe na-asị:

 

Nsọ, Nsọ, Nsọ,

Osebrụwa Chineke nke igwe ndịagha,

ebube Gị jupụtara eligwe na ala.

Họzana n’elu kacha elu.

Ọ dị ngọzi bụ onye bịara n’aha Onyenweanyị.

Họzana n’elu kacha elu.